Psalms 133

Abụ nrigo, nke Devid.

Ngọzị nke ibi nʼotu

1Lee ka o si bụrụ ihe dị mma
na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu! a

2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,
nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,
e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,
ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon
na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.
Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,
ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.
Copyright information for IboBIU